Ndị Rom 15

Nʼihi na ọ dị ndị Masidonia na Akaịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na Jerusalem aka.

Romans 15:26 (UKJV) For it has pleased them of Macedonia and Achaia to make a certain contribution for the poor saints which are at Jerusalem.

24Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta.

25Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem ebe m na-ejere ndị nsọ ozi.

26Nʼihi na ọ dị ndị Masidonia na Akaịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na Jerusalem aka.

27Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha.

28Ya mere, mgbe m mezuru nke a, hụkwa na ha anatala onyinye ahụ a tụkọtara ha, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.