30Esi m nʼaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nʼime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpe ekpere, na-echetanụ m nʼekpere unu nʼihu Chineke.
31Ka a dọpụta m nʼaka ndị na-ekweghị ekwe nọ na Judịa. Ka ọrụ m maka Jerusalem bụrụ ihe ndị nsọ nọ ebe ahụ ga-anabata.
32Ka ọ ga-abụ site nʼuche Chineke, aga m abịakwute unu nʼọṅụ kurukwa ume ndụ na nnọkọ mụ na unu.
33Ka Chineke ahụ na-enye udo, nọnyere unu niile. Amen.