28Ya mere, mgbe m mezuru nke a, hụkwa na ha anatala onyinye ahụ a tụkọtara ha, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen.
29Amaara m na mgbe m ga-abịakwute unu, aga m abịa nʼime ozuzu oke ngọzị nke Kraịst.
30Esi m nʼaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nʼime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpe ekpere, na-echetanụ m nʼekpere unu nʼihu Chineke.
31Ka a dọpụta m nʼaka ndị na-ekweghị ekwe nọ na Judịa. Ka ọrụ m maka Jerusalem bụrụ ihe ndị nsọ nọ ebe ahụ ga-anabata.
32Ka ọ ga-abụ site nʼuche Chineke, aga m abịakwute unu nʼọṅụ kurukwa ume ndụ na nnọkọ mụ na unu.