21Gị onye na-akụziri mmadụ ibe gị ihe, ị na-akụzikwara onwe gị? Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ezula ohi, ị na-ezu ohi?
22Gị onye na-asị mmadụ akwala iko, ị na-akwa iko? Gị onye na-akpọ arụsị ihe arụ, ị na-ezuru ihe dị nʼụlọ arụsị nʼohi?
23Gị onye na-anya isi na ị maara iwu, ị na-emenye Chineke ihere site nʼimebi iwu ahụ?
24Dịka esi dee ya, “Ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke nʼihi unu.”
25Obibi ugwu bara uru nʼezie ma ọ bụrụ na ị na-edebe iwu, ma ọ bụrụ na ị na-emebi iwu, obibi ugwu gị dịka mgbe i bighị ugwu.