25Obibi ugwu bara uru nʼezie ma ọ bụrụ na ị na-edebe iwu, ma ọ bụrụ na ị na-emebi iwu, obibi ugwu gị dịka mgbe i bighị ugwu.
26Ọ bụrụ na ndị e bighị ugwu na-edebe ihe iwu kwuru, ọ bụ na a gaghị agụ ebighị ugwu ha dịka obibi ugwu?
27Ya bụ, ndị ahụ a na-ebighị ugwu nʼanụ ahụ ma na-edebe iwu ga-ama unu ikpe, bụ ndị nwere iwu ahụ e dere nʼakwụkwọ na ndị e bikwara ugwu ma na-emebi iwu.
28Ị bụ ezigbo onye Juu abụghị nke elu ahụ. Ezigbo ibi ugwu abụkwaghị ihe a na-ahụ nʼanụ ahụ.
29Kama ezigbo onye Juu bụ onye ọbụla nke bụ ya nʼime mmụọ. Ezigbo obibi ugwu bụkwa nke ime obi, nke mmụọ, ọ bụghị nke e dere ede. Otuto ya esiteghị nʼaka mmadụ kama o sitere nʼaka Chineke.