Ndị Rom 3

Ọ bara uru nʼụzọ niile. Nke mbụ, ọ bụ ndị Juu ka e weere okwu Chineke nyefee nʼaka.

Romans 3:2 (UKJV) Much every way: chiefly, because that unto them were committed the oracles of God.

1Ọ dị uru pụrụ iche mmadụ nwere nʼihi na ọ bụ onye Juu? Gịnị bụkwa uru ahụ dị ukwuu nke dị na-ebiri mmadụ ugwu?

2Ọ bara uru nʼụzọ niile. Nke mbụ, ọ bụ ndị Juu ka e weere okwu Chineke nyefee nʼaka.

3Gịnị ga-emezi ma ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime ha ekwesighị ntụkwasị obi? Chineke, ọ ga-eji nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha ghara ikwesi ntụkwasị obi?

4Ọ pụghị ịdị otu a! Kama ka ọ bụrụ ihe pụtara ihe na Chineke bụ onye eziokwu, ma mmadụ niile bụ ndị okwu ụgha, dịka e dere ya, “Ka e nwe ike gosipụta na ị na-ekwu eziokwu mgbe ọbụla i kwuru okwu, na ekpegbukwa mgbe i na-ekpe ikpe.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.