29Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ.
30Nʼihi na Chineke dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume.
31Ọ bụrụ na ọ dị otu a, anyị na-esite nʼokwukwe anyị mee ka iwu ghara ịdị ire? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesiri ya.