Ndị Rom 3

Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ.

Romans 3:29 (UKJV) Is he the God of the Jews only? is he not also of the Gentiles? Yes, of the Gentiles also:

27Mgbe o si otu a dịrị, olee ebe ịnya isi anyị dịkwa? Ajụla ịnabata ya. Ọ bụ site iwu dị aṅa? Ọ bụ nke ọrụ? Mba, kama ọ bụ site nʼokwukwe anyị nwere nʼime Kraịst.

28Ya mere, anyị na-agụnye mmadụ nʼonye ezi omume nʼihi okwukwe o nwere, ọ bụghị nʼihi na o mere ihe iwu kwuru.

29Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ.

30Nʼihi na Chineke dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume.

31Ọ bụrụ na ọ dị otu a, anyị na-esite nʼokwukwe anyị mee ka iwu ghara ịdị ire? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesiri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.