Ndị Rom 3

Ya mere, anyị na-agụnye mmadụ nʼonye ezi omume nʼihi okwukwe o nwere, ọ bụghị nʼihi na o mere ihe iwu kwuru.

Romans 3:28 (UKJV) Therefore we conclude that a man is justified by faith without the deeds of the law.

26Ma nʼoge taa, site nʼigosi na ya onwe ya bụ onye ezi omume, na onye a na-agụnye dịka onye ezi omume bụ onye nke kweere na Jisọs.

27Mgbe o si otu a dịrị, olee ebe ịnya isi anyị dịkwa? Ajụla ịnabata ya. Ọ bụ site iwu dị aṅa? Ọ bụ nke ọrụ? Mba, kama ọ bụ site nʼokwukwe anyị nwere nʼime Kraịst.

28Ya mere, anyị na-agụnye mmadụ nʼonye ezi omume nʼihi okwukwe o nwere, ọ bụghị nʼihi na o mere ihe iwu kwuru.

29Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ.

30Nʼihi na Chineke dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.