6Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya.
7“Ngọzị na-adịrị ndị a gbaghaara ajọ omume ha niile, ndị ekpuchikwara mmehie ha niile.
8Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.”
9Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya.
10Olee mgbe a gụrụ ya nye ya? Ọ bụ tupu e bie ya ugwu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Ọ bụghị mgbe e bichara ya ugwu kama ọ bụ tupu e bie ya ugwu.