9Ma lee! Unu onwe unu anaghị ebizi ndụ nʼusoro nke anụ ahụ, kama unu na-ebi nʼusoro nke Mmụọ Nsọ nʼihi na Mmụọ nke Chineke bi nʼime unu. Onye ọbụla na-enweghị Mmụọ nke Kraịst abụghị nke ya.
10Ọ bụrụkwa na Kraịst bi nʼime unu, anụ ahụ unu ga-abụ ihe nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị, ma mmụọ unu dị ndụ nʼihi na a gụọla unu na ndị ezi omume.
11Ọ bụrụ na Mmụọ onye mere ka Jisọs si nʼọnwụ bilie, bi nʼime gị, onye ahụ nke mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ site nʼike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nʼime gị.
12Ya mere, ụmụnna m, anyị ji ụgwọ ma ọ bụghị anụ ahụ ka anyị ji ụgwọ ịdị ndụ dịka ọchịchọ ya si dị.
13Ọ bụrụ na unu na-ebi ndụ dịka anụ ahụ si chọọ, unu ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na unu ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụ ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ.