32Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya?
33Onye pụrụ ibo ndị ahụ Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke na-agụ mmadụ dịka onye ezi omume.
34Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ.
35Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ mkpagbu. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha?
36Dịka e dere ya, “Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.”