30Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto.
31Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị?
32Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya?
33Onye pụrụ ibo ndị ahụ Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke na-agụ mmadụ dịka onye ezi omume.
34Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ.