Ndị Rom 8

Ịtụkwasị uche nʼihe nke anụ ahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasị uche nʼihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na udo.

Romans 8:6 (UKJV) In order to be carnally minded is death; but to be spiritually minded is life and peace.

4Ka izu ezu nke ihe niile iwu chọrọ nʼaka anyị bụrụ ihe e mezuru nʼime anyị, bụ ndị na-adịghị ebi ndụ dịka ọchịchọ anụ ahụ si dịrị, kama dịka ọchịchọ Mmụọ Nsọ si dị.

5Ndị niile na-ebi ndụ ha dịka anụ ahụ siri chọọ, na-ebi ya naanị imezu agụụ niile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị niile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Mmụọ na-achọ.

6Ịtụkwasị uche nʼihe nke anụ ahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasị uche nʼihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na udo.

7Nʼihi na onye ọbụla tụkwasịrị uche ya nʼihe nke anụ ahụ na-ebuso Chineke agha, ọ naghị edebe iwu nke Chineke. Nʼeziokwu, ọ gaghị enwe ike idebe ya.

8Ya mere, ndị na-erubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.