Ndị Rom 9

Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.”

Romans 9:28 (UKJV) For he will finish the work, and cut it short in righteousness: because a short work will the Lord make upon the earth.

26Ma, “Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ. ’ ”

27Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel, “Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri, maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta.

28Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.”

29Ọ bụkwa dịka Aịzaya kwuru na mbụ, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ahapụrụghị anyị ụmụ ụmụ, anyị gara adị ka Sọdọm, anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.”

30Gịnịkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na o enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ha gbasoro ezi omume, ma ha natara ya, bụ ezi omume nke sitere nʼokwukwe,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.