Ndị Rom 9

Ma, “Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ. ’ ”

Romans 9:26 (UKJV) And it shall come to pass, that in the place where it was said unto them, All of you are not my people; there shall they be called the children of the living God.

24Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ?

25Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya, “Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m. Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”

26Ma, “Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ. ’ ”

27Aịzaya bere akwa nʼihi ụmụ Izrel, “Ọ bụ ezie na ọnụọgụgụ ụmụ Izrel dịka uzuzu dị nʼakụkụ osimiri, maọbụ naanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta.

28Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ọ ga-eme ọsịịsọ nʼikpe ahụ ma kpebie ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.