22Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi?
23Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a.
24Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ?
25Dịka o kwuru nʼakwụkwọ Hosiya, “Aga m akpọ ha ‘ndị m,’ bụ ndị na-abụghị ndị m. Aga m akpọkwa ya ‘onye m hụrụ nʼanya’ bụ onye m na-ahụghị nʼanya.”
26Ma, “Nʼotu ebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ bụkwa ebe a ga-anọ kpọọ ha, ‘Ụmụ nke Chineke dị ndụ. ’ ”