20Onye ka ị bụ gị mmadụ efu, iji ajụ Chineke ajụjụ? “Nkata mmadụ na-akpa ọ ga-ajụ onye na-akpa ya ajụjụ, ‘Onye sị gị kpaa m otu a?’ ”
21Otu a kwa, onye ọkpụ ite o nweghị ike isite nʼotu ụrọ ahụ o nwere kpụọ ụdị ite ọbụla masịrị ya, ụfọdụ ite pụrụ iche na ụfọdụ e ji eje ozi nʼụlọ?
22Ọ bụrụkwanụ na Chineke ekpebie igosi iwe ya na ime ka a mara ike ya site nʼinwe oke ndidi banyere ndị oke iwe ya ga-adakwasị bụ ndị a kwadoro maka mbibi?
23Ma ọ bụrụkwanụ na o mere nke a iji mee ka ndị ahụ ọ na-emere ebere mata ịba ụba nke ebube ya, bụ ndị o bururị ụzọ kwadoo maka ebube a.
24Ọ bụladị anyị bụ ndị ọ kpọkwara, ọ bụghị naanị site na ndị Juu kama site na ndị mba ọzọ?