Rut 1

Ma Naomi gwara ya sị, “Lee, nwunye nwanne di gị alaghachikwurula ndị nwe ya na chi ya niile, soro ya laa.”

Ruth 1:15 (UKJV) And she said, Behold, your sister in law is gone back unto her people, and unto her gods: return you after your sister in law.

13unu ga-echere ruo mgbe ha tolitere? Unu ga-anọ na-alụghị di ọzọ? Mba, ụmụ m ndị inyom, ọnọdụ m dị ilu karịa nke unu, nʼihi na Onyenwe anyị esepụtala aka ya imegide m.”

14Ha welitere olu ha kwaa akwa ọzọ. Mgbe ahụ Ọpa suturu nne di ya ọnụ ma Rut kwusịrị ike nʼebe ọ nọ.

15Ma Naomi gwara ya sị, “Lee, nwunye nwanne di gị alaghachikwurula ndị nwe ya na chi ya niile, soro ya laa.”

16Ma Rut zara, “Akwagidela m ka m hapụ gị, maọbụ ime ka m site nʼiso gị chigharịa. Aga m esoro gị gaa ebe ọbụla ị na-aga. Aga m esokwa gị biri nʼebe ọbụla ị ga-ebi; ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m,

17ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ebe ahụ kwa ka a ga-eli m. Ka Onyenwe anyị mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ekwere ka ihe ọzọ, ma ọ bụghị ọnwụ, kewaa mụ na gị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.