12Laghachinụ azụ ụmụ m. Emeela m agadi ịlụ di ọzọ. A sịkwarị na olileanya fọdụụrụ m ịlụ di na ịmụta ụmụ ndị ikom nʼabalị taa,
13unu ga-echere ruo mgbe ha tolitere? Unu ga-anọ na-alụghị di ọzọ? Mba, ụmụ m ndị inyom, ọnọdụ m dị ilu karịa nke unu, nʼihi na Onyenwe anyị esepụtala aka ya imegide m.”
14Ha welitere olu ha kwaa akwa ọzọ. Mgbe ahụ Ọpa suturu nne di ya ọnụ ma Rut kwusịrị ike nʼebe ọ nọ.
15Ma Naomi gwara ya sị, “Lee, nwunye nwanne di gị alaghachikwurula ndị nwe ya na chi ya niile, soro ya laa.”
16Ma Rut zara, “Akwagidela m ka m hapụ gị, maọbụ ime ka m site nʼiso gị chigharịa. Aga m esoro gị gaa ebe ọbụla ị na-aga. Aga m esokwa gị biri nʼebe ọbụla ị ga-ebi; ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m,