Rut 1

Laghachinụ azụ ụmụ m. Emeela m agadi ịlụ di ọzọ. A sịkwarị na olileanya fọdụụrụ m ịlụ di na ịmụta ụmụ ndị ikom nʼabalị taa,

Ruth 1:12 (UKJV) Return, my daughters, go your way; for I am too old to have an husband. If I should say, I have hope, if I should have an husband also to night, and should also bear sons;

10Ma Ọpa na Rut zara Naomi sị ya, “E, anyị agaghị ala. Anyị ga-esoro gị laghachikwuru ndị gị.”

11Naomi zara sị ha, “Laghachinụ ụmụ m, ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ga-eji soro m laa? E nwere m ike ịmụta ụmụ ndị ikom ọzọ ndị ga-abụ di unu?

12Laghachinụ azụ ụmụ m. Emeela m agadi ịlụ di ọzọ. A sịkwarị na olileanya fọdụụrụ m ịlụ di na ịmụta ụmụ ndị ikom nʼabalị taa,

13unu ga-echere ruo mgbe ha tolitere? Unu ga-anọ na-alụghị di ọzọ? Mba, ụmụ m ndị inyom, ọnọdụ m dị ilu karịa nke unu, nʼihi na Onyenwe anyị esepụtala aka ya imegide m.”

14Ha welitere olu ha kwaa akwa ọzọ. Mgbe ahụ Ọpa suturu nne di ya ọnụ ma Rut kwusịrị ike nʼebe ọ nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.