11Boaz zara sị ya, “Anụla m ihe niile i meere nne di gị site nʼoge di gị nwụrụ, na otu i si hapụ nne gị na nna gị, na ala ebe amụrụ gị, bịa nʼebe a ibi nʼetiti ndị ị na-amaghị na mbụ.
12Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.”
13Rut zara sị ya, “Ka m gaa nʼihu na-achọta amara nʼebe ị nọ, onyenwe m. Nʼihi na ị kasịela m obi, gwakwa m, odibo nwanyị gị, okwu dị nro. Ọ bụ ezie na m abụghị otu nʼime ndị odibo nwanyị gị.”
14Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.” Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ.
15Mgbe o biliri ịchịkọtakwa ọka, Boaz nyere ụmụ okorobịa ya iwu, “Hapụnụ ya ka ọ chịkọta ọka ọ bụladị nʼetiti ukwu ọka ndị guzo eguzo, unu agwala ya okwu ihere ọbụla.