Rut 2

Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.”

Ruth 2:12 (UKJV) The LORD recompense your work, and a full reward be given you of the LORD God of Israel, under whose wings you are come to trust.

10Mgbe Boaz na-agwa ya okwu, Rut hulatara isi ya ala. Emesịa o kwuru sị, “Gịnị mere m ji chọta ụdị amara dị otu a nʼebe ị nọ, na ị hụtara m, ebe ị maara na m bụ naanị onye mba ọzọ?”

11Boaz zara sị ya, “Anụla m ihe niile i meere nne di gị site nʼoge di gị nwụrụ, na otu i si hapụ nne gị na nna gị, na ala ebe amụrụ gị, bịa nʼebe a ibi nʼetiti ndị ị na-amaghị na mbụ.

12Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka Onyenwe anyị onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.”

13Rut zara sị ya, “Ka m gaa nʼihu na-achọta amara nʼebe ị nọ, onyenwe m. Nʼihi na ị kasịela m obi, gwakwa m, odibo nwanyị gị, okwu dị nro. Ọ bụ ezie na m abụghị otu nʼime ndị odibo nwanyị gị.”

14Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.” Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.