Rut 2

Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’ ”

Ruth 2:21 (UKJV) And Ruth the Moabitess said, He said unto me also, You shall keep fast by my young men, until they have ended all my harvest.

19Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.” Rut kọọrọ nne di ya banyere onye ahụ ọ rụrụ ọrụ na nke ya. Ọ sịrị, “Aha nwoke mụ na ya rụrụ ọrụ bụ Boaz.”

20Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị.”

21Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’ ”

22Naomi sịrị Rut, nwunye nwa ya, “Nwa m nwanyị, ọ kaara gị mma ime dịka o kwuru. Soro ụmụ agbọghọ nọ nʼubi ya nʼazụ tụtụọ ọka ị na-atụtụ, nʼihi na nʼubi onye ọzọ, e nwere ike imerụ gị ahụ.”

23Ya mere, Rut sogidere ụmụ agbọghọ Boaz na-atụtụ ọka, tutu ruo ọgwụgwụ ịghọ ọka balị na wiiti. Ya na nne di ya bigidekwara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.