4Nʼoge ahụ, Boaz nʼonwe ya si na Betlehem bịarute nʼubi ahụ, kelee ndị ahụ na-aghọ mkpụrụ nʼubi sị ha, “Onyenwe anyị nọnyere unu.” Ha niile zakwara sị ya, “Onyenwe anyị gọzie gị.”
5Mgbe Boaz hụrụ Rut, ọ jụrụ onyeisi ndị ọrụ ubi ya sị, “Onye ka nwanyị a bụ?”
6Onye nlekọta ọrụ ubi ahụ zaghachiri, “Ọ bụ onye Moab ahụ so Naomi lọta.
7Ọ sịrị, ‘Biko kwere ka m soro ndị ọrụ nʼazụ tụtụkọtaa ukwu ọka ha hapụrụ.’ Kemgbe ụtụtụ ọ bịara, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya karịakwa naanị nwa mgbe nta o zuru ike nʼokpuru ndo.”
8Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a.