Rut 2

Ọ sịrị, ‘Biko kwere ka m soro ndị ọrụ nʼazụ tụtụkọtaa ukwu ọka ha hapụrụ.’ Kemgbe ụtụtụ ọ bịara, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya karịakwa naanị nwa mgbe nta o zuru ike nʼokpuru ndo.”

Ruth 2:7 (UKJV) And she said, I pray you, let me glean and gather after the reapers among the sheaves: so she came, and has continued even from the morning until now, that she tarried a little in the house.

5Mgbe Boaz hụrụ Rut, ọ jụrụ onyeisi ndị ọrụ ubi ya sị, “Onye ka nwanyị a bụ?”

6Onye nlekọta ọrụ ubi ahụ zaghachiri, “Ọ bụ onye Moab ahụ so Naomi lọta.

7Ọ sịrị, ‘Biko kwere ka m soro ndị ọrụ nʼazụ tụtụkọtaa ukwu ọka ha hapụrụ.’ Kemgbe ụtụtụ ọ bịara, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya karịakwa naanị nwa mgbe nta o zuru ike nʼokpuru ndo.”

8Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a.

9Lezie anya nʼubi ebe ndị ikom na-ewe ihe ubi, ma soro ụmụ agbọghọ ndị a. Enyela m ndị ikom ndị a iwu ka ha ghara ịmetụ gị aka. Mgbe ọbụla agụụ mmiri gụrụ gị, gaa nʼite mmiri ndị ahụ ndị ikom gbanyere mmiri kuru mmiri ṅụọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.