1Otu ụbọchị, Naomi, nne di Rut, gwara ya okwu sị, “Nwa m nwanyị, ọ bụ na o rubeghị mgbe m ga-achọtara gị ụlọ nke aka gị, ebe a ga-anọ lekọtazie gị anya nke ọma?
2Ọ bụ na Boaz, onye gị na ụmụ agbọghọ ya so rụọ ọrụ ịchịkọta ọka abụghị onye agbụrụ anyị? Lee, nʼabalị taa ka ọ ga-afụcha ọka balị nʼebe ịzọcha ọka.
3Ugbu a, gaa saa ahụ gị, teekwa mmanụ isi ụtọ, yirikwa uwe mara mma. I mesịa, gaa nʼebe ịzọcha ọka, ma ekwekwala ka ọ hụ gị, tutu ruo mgbe o risiri nri ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ.