11Ma ugbu a, nwa m nwanyị, atụla ụjọ. Aga m emezuru gị dịka i si rịọọ, nʼihi na mmadụ niile maara na ị bụ onye nwere ezi agwa.
12Ọ bụ ezie na m bụ onye mgbapụta dị nso nke ezinaụlọ anyị, ma o nwere onye ọzọ dị ezi nso karịa m.
13Nọdụ nʼebe a nʼabalị a. Nʼụtụtụ, ọ bụrụ na onye ahụ ekwere imezu ọrụ ya dịka onye mgbapụta, ya rụzuo ya. Ọ bụrụ na o kwere, ọ dị mma, ọ bụrụkwanụ na o kweghị, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m emezu ya. Ugbu a, dinara ala ruo ụtụtụ.”
14Ya mere, Rut dinara nʼụkwụ ya ruo ụtụtụ. Ma chi abọzibeghị nke ọma mgbe o si nʼebe ahụ bilie nʼihi na Boaz sịrị ya, “Ekwela ka onye ọbụla mata na nwanyị bịara nʼebe ịzọcha ọka.”
15O gwakwara Rut okwu sị ya, “Chịta akwa mgbokwasị gị, gbasaa ya.” Ya mere Rut gbasara akwa ya, Boaz manyere ya ọtụtụ ọka balị isii, bokwasị ya Rut, onye buuru ya banye nʼime obodo.