15O gwakwara Rut okwu sị ya, “Chịta akwa mgbokwasị gị, gbasaa ya.” Ya mere Rut gbasara akwa ya, Boaz manyere ya ọtụtụ ọka balị isii, bokwasị ya Rut, onye buuru ya banye nʼime obodo.
16Mgbe Rut bịakwutere nne di ya, Naomi jụrụ ya sị, “Nwa m nwanyị, olee otu ihe si gaa?” Rut gwara ya ihe niile Boaz meere ya, sị,
17“Ọ manyeere m ọtụtụ ọka balị isii ndị a si m, ‘O kwesighị ka ị gbara aka lakwuru nne di gị.’ ”
18Naomi zara si ya, “Chere, nwa m nwanyị, ruo mgbe ị ga-ahụ otu okwu a ga-esi bie. Nwoke a agaghị ezu ike tutu ruo mgbe o kwubiri okwu a taa.”