1Ya mere, Boaz pụrụ gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ, nọdụ ala nʼebe ahụ. Ọ dịghị anya onye mgbapụta ahụ dị nso nke Boaz kwuru okwu banyere ya si nʼebe ahụ na-agafe. Boaz kpọrọ ya sị, “Enyi m bịa nọdụ ala.” Ọ bịara nọdụ ala.
2Boaz kpọrọ mmadụ iri, ndị bụ ndị okenye obodo ahụ, gwa ha, “Nọdụnụ ala nʼebe a.” Ha mere otu ahụ.
3Mgbe ahụ, ọ gwara nwoke onye mgbapụta ahụ dị nso sị, “Naomi, onye si nʼala ndị Moab lọta, na-achọ ire ala nwanna anyị nwoke Elimelek.
4Ahụrụ m na o kwesiri ka m buru ụzọ gwa gị ka ị zụọ ya nʼihu ndị a nọ ọdụ nʼebe a, na nʼihu ndị okenye obodo anyị. Ọ bụrụ na ị ga-agbara ya, gwa m, ọ bụrụkwanụ na ị gaghị agbara ya, gwa m, ka m mara ihe m ga-eme. Nʼihi na ọ bụ gị ka ọ dịrị ịgbapụta ya. Mụ onwe m na-esote gị.” Ọ zara sị, “Aga m agbapụta ya.”
5Mgbe ahụ, Boaz sịrị, “Nʼụbọchị ị ga-azụrụ ala ahụ site nʼaka Naomi ka ị ga-enwetakwa Rut onye Moab bụ nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ, ime ka aha onye ahụ nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide.”