6Na nke a, onye nchekwa mgbapụta ahụ sịrị, “Apụghị m ịgbapụta ya nʼihi na e nwere m ike itinye ihe nketa m na nsogbu. Gị onwe gị gbapụta ya. Nke a agaghị ekwe m omume.”
7Na mgbe ochie nʼala Izrel, ime ka mgbapụta ihe na iwefe ihe site nʼaka baa nʼaka zuo oke, otu onye ga-eyipụ akpụkpọụkwụ ya were ya nye onye nke ọzọ. Otu a ka e si ekpebi okwu gbasara orire na ọzụzụ, na-ime ka ihe ndị ọzọ guzosie ike nʼala Izrel.
8Nʼihi ya, mgbe nwoke ahụ gwara Boaz sị ya, “Zụrụ ala ahụ nʼonwe gị,” o yipụtara akpụkpọụkwụ ya.
9Mgbe ahụ, Boaz kwupụtara na ntị ndị okenye ndị ahụ na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Unu bụ ndị akaebe na esitela m nʼaka Naomi zụrụ ala niile Elimelek, na Kilịọn na Mahlọn nwere.
10Azụrụkwala m Rut onye Moab, nwunye Mahlọn ka ọ bụrụ nwunye m, ime ka aha onye nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide, ka aha ha hapụ ifu nʼetiti ndị ikwu ya maọbụ site nʼobodo ebe amụrụ ya. Taa unu niile bụ ndị akaebe m.”