13Onye m hụrụ dị m ka ụda máá e kechiri nʼakpa nke dị nʼetiti ara m abụọ.
14Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.
15Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya. Leenụ ka ị si maa mma! Anya gị dịka nduru.
16Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke. E, ị mara mma. Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.
17Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida, ntuhie ya bụkwa osisi fịa.