2Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ, nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.
3Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma, aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta, ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.
4Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa. Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya. Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị. Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya. Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
5Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya, unu ụmụ agbọghọ Jerusalem. Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
6Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji. Ọ bụ anwụ gbajiri m. Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m, zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị, ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.