Taịtọs 1

Mgbe oge imezu nkwa ahụ ruru, o mere ka okwu ya pụta ìhè site na nkwusa oziọma, nke e nyefere m nʼaka idebe, dị ka Chineke Onye nzọpụta anyị si nye ya nʼiwu.

Titus 1:3 (UKJV) But has in due times manifested his word through preaching, which is committed unto me according to the commandment of God our Saviour;

1Akwụkwọ ozi a si nʼaka m, Pọl, odibo Chineke, na onyeozi Jisọs Kraịst, onye ahọpụtara ime ka okwukwe ndị Chineke, na nghọta banyere ịmara eziokwu ahụ na-eduba na ndụ ịsọpụrụ Chineke gaa nʼihu,

2nke a dabere nʼolileanya maka ndụ ebighị ebi, nke Chineke onye na-adịghị agha ụgha kwerelarị na nkwa tupu mmalite nke oge.

3Mgbe oge imezu nkwa ahụ ruru, o mere ka okwu ya pụta ìhè site na nkwusa oziọma, nke e nyefere m nʼaka idebe, dị ka Chineke Onye nzọpụta anyị si nye ya nʼiwu.

4Ọ bụ gị Taịtọs, ezi nwa m nwoke nʼime okwukwe nke anyị nwekọrọ. Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị dịrị gị.

5Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ụfọdụ a na-edozibeghị, ka ị họpụtakwa ndị okenye nʼobodo niile, dị ka m siri nye gị nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.