Taịtọs 1

Ọ bụ gị Taịtọs, ezi nwa m nwoke nʼime okwukwe nke anyị nwekọrọ. Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị dịrị gị.

Titus 1:4 (UKJV) To Titus, mine own son after the common faith: Grace, mercy, and peace, from God the Father and the Lord Jesus Christ our Saviour.

2nke a dabere nʼolileanya maka ndụ ebighị ebi, nke Chineke onye na-adịghị agha ụgha kwerelarị na nkwa tupu mmalite nke oge.

3Mgbe oge imezu nkwa ahụ ruru, o mere ka okwu ya pụta ìhè site na nkwusa oziọma, nke e nyefere m nʼaka idebe, dị ka Chineke Onye nzọpụta anyị si nye ya nʼiwu.

4Ọ bụ gị Taịtọs, ezi nwa m nwoke nʼime okwukwe nke anyị nwekọrọ. Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị dịrị gị.

5Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ụfọdụ a na-edozibeghị, ka ị họpụtakwa ndị okenye nʼobodo niile, dị ka m siri nye gị nʼiwu.

6Ọ ga-abụ onye a na-enweghị ihe ịta ụta, ọ ga-abụ onye na-alụ otu nwanyị. Ụmụ ya bụ ndị kwere ekwe, ndị ama na ha anaghị ebi ndụ ọjọọ, maọbụ na-eme isiike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.