Taịtọs 1

Ọ ga-abụ onye a na-enweghị ihe ịta ụta, ọ ga-abụ onye na-alụ otu nwanyị. Ụmụ ya bụ ndị kwere ekwe, ndị ama na ha anaghị ebi ndụ ọjọọ, maọbụ na-eme isiike.

Titus 1:6 (UKJV) If any be blameless, the husband of one wife, having faithful children not accused of riot or unruly.

4Ọ bụ gị Taịtọs, ezi nwa m nwoke nʼime okwukwe nke anyị nwekọrọ. Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị dịrị gị.

5Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ụfọdụ a na-edozibeghị, ka ị họpụtakwa ndị okenye nʼobodo niile, dị ka m siri nye gị nʼiwu.

6Ọ ga-abụ onye a na-enweghị ihe ịta ụta, ọ ga-abụ onye na-alụ otu nwanyị. Ụmụ ya bụ ndị kwere ekwe, ndị ama na ha anaghị ebi ndụ ọjọọ, maọbụ na-eme isiike.

7Ebe ọ bụ na onye nlekọta nʼahụ ihe banyere chọọchị Chineke, ọ ga-abụ onye na-enweghị ihe ịta ụta. Ọ gaghị abụ onye nganga, onye na-ewe iwe ọkụ, onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-alụ ọgụ mgbe niile, onye hụrụ ego nʼanya.

8Ọ ga-abụ onye na-anabata ndị ọbịa, na onye na-ahụ ezi ihe nʼanya. Ọ ga-abụ onye na-akwanyere onwe ya ugwu, ezi mmadụ ụzọ ya kwụ ọtọ, onye dị nsọ, na onyeisi zuruoke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.