Taịtọs 2

Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe.

Titus 2:1 (UKJV) But speak you the things which become sound doctrine:

1Nʼakụkụ nke gị, na-akụzi ihe kwesiri eziokwu nke okwukwe.

2Gwa ndị okenye nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuruoke, ka ha bụrụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nʼanya, na ndị nwekwara ntachiobi.

3Nʼotu aka ahụ, gwa ndị okenye nwanyị ka ha na-eme omume dị ka ụmụ nwanyị dị nsọ. Ka ha ghara ịbụ ndị na-agba asịrị maọbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya oke. Kama ha na-akụzi ihe dị mma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.