Taịtọs 2

ka ha ghara izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Nʼụzọ dị otu a, ha ga-ewetara ihe anyị na-akụzi maka Chineke Onye nzọpụta anyị otuto nʼihe niile ha na-eme.

Titus 2:10 (UKJV) Not embezzling, but showing all good fidelity; that they may adorn the doctrine of God our Saviour in all things.

8Ka ozi gị bụrụ nke kwụ ọtọ mmadụ apụghị ịma ikpe, ka ihere mee onye na-agbagha gị okwu, ebe ọ bụ na onweghi ihe ọjọọ ọ ga-ekwu gbasara anyị.

9Gwa ndị ohu ka ha na-erubere ndị nwe ha isi, ka ha na-eme ihe ga-atọ onyenwe ha ụtọ mgbe niile. Ka ha hapụ ịsa ndị nwe ha okwu,

10ka ha ghara izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Nʼụzọ dị otu a, ha ga-ewetara ihe anyị na-akụzi maka Chineke Onye nzọpụta anyị otuto nʼihe niile ha na-eme.

11Nʼihi na Chineke emela ka amara ya nke wetaara mmadụ niile nzọpụta pụta ìhè.

12Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.