14Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu gwara m sị, “Kwusaa ozi a, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru sị, ‘Ekworo m dị ukwuu nʼebe Jerusalem na Zayọn nọ,
15ma iwe m dị ukwuu megide ndị mba niile ahụ onwe ha juru afọ. Nʼihi na mgbe iwe m dị nta, ha nyere aka ime ka ahụhụ ahụ karịa njọ.’
16“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
17“Kwusaakwa ọzọ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọganihu ga-adịkwa nʼobodo m niile ọzọ. Onyenwe anyị ga-akasị Zayọn obi ọzọ, ma họpụtakwa Jerusalem.’ ”
18Mgbe ahụ, eweliri m anya m abụọ elu hụ mpi anọ.