16“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
17“Kwusaakwa ọzọ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọganihu ga-adịkwa nʼobodo m niile ọzọ. Onyenwe anyị ga-akasị Zayọn obi ọzọ, ma họpụtakwa Jerusalem.’ ”
18Mgbe ahụ, eweliri m anya m abụọ elu hụ mpi anọ.
19Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sị, “Gịnị ka ihe ndị a bụ?” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ mpi ndị ahụ chụsasịrị Juda, na Izrel, na Jerusalem.”
20Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri m ndị ọkpụ ụzụ anọ.