1Nʼọnwa nke asatọ, nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị ruru Zekaraya nwa Berekaya, nwa Ido, bụ onye amụma ntị, na-asị,
2“Onyenwe anyị were oke iwe megide nna unu ha.
3Nʼihi ya, gwa ha, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. ‘Lọghachikwutenụ m,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara, ‘Mụ onwe m kwa ga-alọghachikwute unu.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.
4Unu adịla ka ndị nna unu ha, ndị amụma mbụ kpọrọ oku si, Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara: ‘Sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ajọ omume unu chigharịa’ ma ha achọghị ịnụ maọbụ gee m ntị, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.