19Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sị, “Gịnị ka ihe ndị a bụ?” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ mpi ndị ahụ chụsasịrị Juda, na Izrel, na Jerusalem.”
20Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gosiri m ndị ọkpụ ụzụ anọ.
21Asịrị m, “Gịnị ka ndị na-abịa ime?” Ọ zaghachiri m, “Ndị a bụ mpi anọ ndị ahụ chụsasịrị Juda, ime ka onye ọbụla ghara inwe ike iwelite isi ya. Ma ndị a abịala imenye ha ụjọ, na ịtụda mpi mba niile, bụ ndị ahụ buliri mpi ha imegide ala Juda, na ịchụsa ndị ya.”