Zekaraya 10

Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha, ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya. Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ, ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.

Zechariah 10:7 (UKJV) And they of Ephraim shall be like a mighty man, and their heart shall rejoice as through wine: yea, their children shall see it, and be glad; their heart shall rejoice in the LORD.

5Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha, ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile. Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha, ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya.

6“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike, zọpụtakwa ụlọ Josef. Aga m eme ka ha lọghachita, nʼihi na aga m egosi ha obi ebere. Ha ga-adị ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha, aga m azakwa arịrịọ ha.

7Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha, ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya. Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ, ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.

8Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku, chịkọtaa ha. Nʼezie, aga m agbapụta ha, ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ.

9A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche, ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya. Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ; ha ga-alọtakwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.