11Nʼụbọchị ahụ ka e mere ka ọgbụgba ndụ ahụ gharakwa ịdị. Mgbe ahụ, ndị ahụ a na-akpagbu nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, bụ ndị na-ele m anya matara na ọ bụ okwu Onyenwe anyị.
12Mgbe ahụ, agwara m ha, “Ọ bụrụ na ọ masịrị unu, unu kwụọ m ụgwọ ọrụ m, ọ bụrụkwa na ọ masịghị unu, deberenụ onwe unu ego unu.” Nʼihi nke a, ha gụpụtara mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ, jiri ya kwụọ m ụgwọ.
13Onyenwe anyị gwara m, “Tụpụrụ ya ọkpụ ite,” bụ ọnụahịa magburu onwe ya bụ nke ha rụrụ nʼisi m. Ya mere, eweere m iri ọlaọcha atọ ahụ tụpụrụ ya ọkpụ ite nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
14Mgbe ahụ, agbajiri m mkpanaka m nke abụọ a na-akpọ Ịdị nʼotu, izipụta na njikọta maọbụ ịdị nʼotu dị nʼetiti Juda na Izrel adịghịkwa.
15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m, “Chịrịkwa ngwa ọrụ nke onye ọzụzụ atụrụ nzuzu ahụ,