Zekaraya 11

“Ahụhụ dịrị onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-abaghị uru, nke na-adịghị elezi igwe ewu na atụrụ ya anya. Ka mma agha gbupụ ya otu aka, ghụpụkwa ya anya aka nri ya. Ka ogwe aka ya kpọnwụọkwa kpamkpam. Otu a, anya aka nri ya ga-akpọkwa.”

Zechariah 11:17 (UKJV) Woe to the idol shepherd that left the flock! the sword shall be upon his arm, and upon his right eye: his arm shall be clean dried up, and his right eye shall be utterly darkened.

15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m, “Chịrịkwa ngwa ọrụ nke onye ọzụzụ atụrụ nzuzu ahụ,

16nʼihi na ana m aga ịkpọlite otu onye ọzụzụ atụrụ nke na-agaghị elekọta ụmụ atụrụ furu efu, maọbụ chọọ ndị na-etolite, maọbụ gwọọ ndị merụrụ ahụ, maọbụ nye ndị ahụ dị ike nri. Kama ọ ga-eri anụ atụrụ ndị ahụ ahụ ha dị mma, nyakapụkwa ụkwụ ha niile.

17“Ahụhụ dịrị onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-abaghị uru, nke na-adịghị elezi igwe ewu na atụrụ ya anya. Ka mma agha gbupụ ya otu aka, ghụpụkwa ya anya aka nri ya. Ka ogwe aka ya kpọnwụọkwa kpamkpam. Otu a, anya aka nri ya ga-akpọkwa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.