2Kwasie akwa ike, gị osisi junipa, nʼihi na osisi sida adaala, nʼihi na e mebiela osisi ukwu ndị niile ahụ mabigara mma oke. Kwasienụ akwa ike, unu osisi ook nke Bashan, nʼihi na e gbudachala oke ọhịa ahụ!
3Gee ntị nʼụzụ akwa nke ndị ọzụzụ atụrụ, e mebiela ebe ịta nri mara mma nke anụ ụlọ ha. Gee ntị ka unu nụrụ olu mbigbọ nke ụmụ ọdụm, nʼihi na e bibiela oke ọhịa nke Jọdan.
4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke m kwuru, “Zụọnụ igwe ewu na atụrụ ndị a ga-egbu egbu nri.
5Ndị na-azụrụ ha na-egbu ha ma ọ dịghị ahụhụ na-abịakwasị ha. Ndị na-erekwa ha na-asị, ‘Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na abụ m ọgaranya.’ Ndị ọzụzụ ha adịghị enwe ọmịiko nʼahụ ha.
6Nʼihi na mụ onwe m agakwaghị egosi ndị ala a obi ebere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Aga m ewere onye ọbụla nʼime ha nyefee nʼaka onye agbataobi ya, na nʼaka eze ha. Ha ga-ebibi ala a kpamkpam, ma mụ onwe m agaghị anapụta onye ọbụla site nʼaka ha.”