10Ala niile, site na Geba ruo Rimọn, nke dị na ndịda Jerusalem ga-adị ka ọzara. Ma ọ bụ naanị Jerusalem ga-adị nʼebe lara elu. Ọ ga-adịkwa nʼọnọdụ ya site nʼọnụ ụzọ ama nke Benjamin ruo nʼebe ọnụ ụzọ ama nke Mbụ, ruo nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼAkụkụ, sitekwa nʼỤlọ elu Hananel ruo nʼebe a na-azọchapụta mmanya eze.
11A ga-ebiju na ya na-enweghị nsogbu. A gaghị emebikwa ya ọzọ. Jerusalem ga-ebikwa nʼudo na-atụghị egwu.
12Nke a bụ ọrịa ọjọọ nke Onyenwe anyị ga-eji kụda mba niile buru agha megide Jerusalem. Anụ ahụ ha ga-ere ure mgbe ha ka guzo ọtọ. Anya ha ga-erekwa ure, ire ha ga-erekwa ure nʼọnụ ha.
13Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-etinye ndị mmadụ oke ụjọ nʼobi. Oke ọgbaaghara ga-adị nʼetiti ha, ha ga-alụsokwa ibe ha ọgụ.
14Ọ bụladị Juda ga-ebu agha na Jerusalem. A ga-akwakọrọ akụ ndị mba ọzọ dị ha nso, bụ ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha, na uwe mara mma.