11A ga-ebiju na ya na-enweghị nsogbu. A gaghị emebikwa ya ọzọ. Jerusalem ga-ebikwa nʼudo na-atụghị egwu.
12Nke a bụ ọrịa ọjọọ nke Onyenwe anyị ga-eji kụda mba niile buru agha megide Jerusalem. Anụ ahụ ha ga-ere ure mgbe ha ka guzo ọtọ. Anya ha ga-erekwa ure, ire ha ga-erekwa ure nʼọnụ ha.
13Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-etinye ndị mmadụ oke ụjọ nʼobi. Oke ọgbaaghara ga-adị nʼetiti ha, ha ga-alụsokwa ibe ha ọgụ.
14Ọ bụladị Juda ga-ebu agha na Jerusalem. A ga-akwakọrọ akụ ndị mba ọzọ dị ha nso, bụ ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha, na uwe mara mma.
15Ọrịa ọjọọ dị otu a ga-adakwasị ịnyịnya niile, na ịnyịnya muul, na ịnyịnya kamel niile, na ịnyịnya ibu niile, na anụ niile dị nʼogige ndị agha ha.