Zekaraya 14

Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ na mba niile ndị ahụ busoro Jerusalem agha, ga-abịa kwa afọ kpọọ isiala nye eze, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ka ha soro mee mmemme ụlọ Ikwu.

Zechariah 14:16 (UKJV) And it shall come to pass, that every one that is left of all the nations which came against Jerusalem shall even go up from year to year to worship the King, the LORD of hosts, and to keep the feast of tabernacles.

14Ọ bụladị Juda ga-ebu agha na Jerusalem. A ga-akwakọrọ akụ ndị mba ọzọ dị ha nso, bụ ọtụtụ ọlaedo na ọlaọcha, na uwe mara mma.

15Ọrịa ọjọọ dị otu a ga-adakwasị ịnyịnya niile, na ịnyịnya muul, na ịnyịnya kamel niile, na ịnyịnya ibu niile, na anụ niile dị nʼogige ndị agha ha.

16Mgbe ahụ, ndị fọdụrụ na mba niile ndị ahụ busoro Jerusalem agha, ga-abịa kwa afọ kpọọ isiala nye eze, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ka ha soro mee mmemme ụlọ Ikwu.

17Ọ bụrụ na ndị ọbụla si na mba dị iche iche esoghị jee Jerusalem ife Eze ahụ, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ha agaghị enwetakwa mmiri ozuzo.

18Ọ bụrụ na ndị Ijipt ajụ ịga soro ndị ọzọ ife ofufe ahụ, ha agaghị enweta mmiri ozuzo. Onyenwe anyị ga-eme ka ọrịa ọjọọ ahụ bịakwasị ha, dịka ọ siri bịakwasị mba ndị ahụ niile jụrụ iso mee mmemme ụlọ Ikwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.