Zekaraya 14

Nʼụbọchị ahụ, ìhè anyanwụ agaghị adị, oyi agaghị adị, mkpụrụ mmiri agaghị adịkwa.

Zechariah 14:6 (UKJV) And it shall come to pass in that day, that the light shall not be clear, nor dark:

4Nʼụbọchị ahụ, ụkwụ ya ga-eguzo nʼelu Ugwu Oliv, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem. Mgbe ahụ, Ugwu Oliv ga-ekewa abụọ, mee ka ndagwurugwu buru ibu dịrị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Nʼihi ya, ugwu ahụ ga-eke onwe ya abụọ. Otu akụkụ ga-adị nʼugwu, nke ọzọ ga-adị nʼụzọ ndịda.

5Unu ga-esi na ndagwurugwu nke ugwu m ahụ gbalaga, nʼihi na ndagwurugwu ahụ ga-eru Azel. Unu ga-agbapụ dịka unu si gbapụ nʼoge gara aga, mgbe ala ọma jijiji ahụ, nʼoge Uzaya bụ eze Juda. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke m ga-abịa, ya na ndị nsọ ya.

6Nʼụbọchị ahụ, ìhè anyanwụ agaghị adị, oyi agaghị adị, mkpụrụ mmiri agaghị adịkwa.

7Ọ ga-abụ ụbọchị pụrụ iche, ụbọchị ehihie na abalị na-agaghị adịkwa. Ọ bụ ụbọchị nke naanị Onyenwe anyị maara. Ma ìhè ga-adịkwa nʼoge anyasị.

8Nʼụbọchị ahụ, mmiri na-enye ndụ ga-esi na Jerusalem na-asọpụta. Ọ ga-ekewa abụọ, ọkara ya ga-asọbanye nʼosimiri Nnu dị nʼihu anyanwụ ebe ọkara nke ọzọ ga-asọbanye nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Ha ga na-asọ nʼọkọchị na nʼudu mmiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.